19Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”
20Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri.
21O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ.
22Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha.
23Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.