Jenesis 41

O ruo mgbe afọ abụọ gasịrị, Fero rọrọ nrọ hụ onwe ya ka o guzo nʼakụkụ mmiri Naịl.

Genesis 41:1 (UKJV) And it came to pass at the end of two full years, that Pharaoh dreamed: and, behold, he stood by the river.

1O ruo mgbe afọ abụọ gasịrị, Fero rọrọ nrọ hụ onwe ya ka o guzo nʼakụkụ mmiri Naịl.

2Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ehi asaa ndị si nʼosimiri Naịl na-apụta. Ehi ndị a buru ibu, maa mma. Ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ. Ha pụtara, bido ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.

3Nʼatụfughị oge, ehi asaa ọzọ soro ha nʼazụ sikwa nʼosimiri Naịl na-apụta. Ma ehi ndị a tara ahụ nke ukwuu. Ha bụ nnọọ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Ha bịara guzo nʼakụkụ ehi ndị ahụ buru ibu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.