12O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya.
13Ihe niile mere dịka o si kọwara anyị. E nyeghachiri m ọnọdụ m, ma kwụba onye nke ọzọ nʼosisi.”
14Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
15Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.”
16Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”