14Ya mere Fero ziri ozi ka a kpọọ Josef. E mere ngwangwa wepụta ya site nʼụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ọ kpụchara afụọnụ ya, gbanwee uwe ya, ọ bịakwara nʼihu Fero.
15Fero gwara Josef sị, “Arọrọ m nrọ ma o nweghị onye ọbụla nwere ike ịkọwara m ihe nrọ m rọrọ pụtara. Ma anụla m na a kọọrọ gị nrọ a rọrọ, i nwere ike ịkọwa ihe nrọ ahụ pụtara.”
16Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”
17Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m.
18Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.