16Josef zara sị ya, “Enweghị m ike ịkọwa nrọ nʼike aka m. Ma Chineke ga-enye Fero ọsịsa udo dịka ọ chọrọ.”
17Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m.
18Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
19Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.
20Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.