17Mgbe ahụ, Fero malitere ịkọwara Josef nrọ ya. O kwuru sị, “Eguzoro m nʼakụkụ osimiri Naịl na nrọ m.
18Mgbe ahụ, ahụrụ m ehi asaa si na mmiri ahụ pụta. Ehi ndị a mara abụba, ma gbaa agba. Ha bidokwara ịta nri nʼetiti ahịhịa riidi.
19Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.
20Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.
21Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.