19Emesịa, a hụrụ m ehi asaa ọzọ ka ha sikwa nʼosimiri ahụ pụta. Ehi ndị a ejighị ahụ. Ha bụ ọkpụkpụ ọkpụkpụ, jọọ njọ ile anya. Nʼezie, ahụtụbeghị m ụdị ehi dị otu a nʼala Ijipt niile.
20Ehi asaa ndị a jọrọ njọ riri ehi ndị ahụ buru ibu, bụ ndị bu ha ụzọ si nʼosimiri ahụ pụta.
21Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.
22“Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.
23Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.