21Ma mgbe ha risiri ehi ndị a, nri ahụ emeghị ka ụdịdị ha gbanwee. Ha dịkwa otu ha dị. Mgbe m hụsịrị ihe a, etetara m nʼụra.
22“Mgbe m rọrọ nrọ ọzọ, a hụrụ m ogbe ọka asaa nke mịrị nʼotu ukwu ọka. Ọka asaa ndị a buru ibu, dị mma ile anya.
23Ogbe ọka asaa ọzọ mịkwara nʼelu ukwu ọka ahụ, ma ndị a kpọnwụrụ akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ nʼihi nʼikuku si nʼọwụwa anyanwụ chakpọrọ ha.
24Ma ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ lodara ọka asaa ndị ahụ mara mma. Akọọlara m ndị majiki ihe ndị a, ma ọ dịghị onye nʼime ha nwere ike ịkọwara m ihe nrọ ndị a pụtara.”
25Mgbe ahụ, Josef sịrị Fero, “Nrọ abụọ Fero rọrọ pụtara otu ihe. Chineke esitela na nrọ ndị a gwa Fero ihe ọ na-aga ime.