28“Dịka m gwara Fero na mbụ, Chineke egosila gị ihe ọ chọrọ ime.
29Afọ asaa na-abịa ga-abụ afọ asaa mgbe nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt niile.
30Emesịa afọ asaa oke ụnwụ ga-eso ha. Mgbe ahụ, a ga-echefu ụba niile nke ala Ijipt. Ụnwụ a ga-ala obodo nʼiyi.
31Agaghị echetakwa na e nwere oge ịba ụba ihe oriri nʼala a, nʼihi oke ụnwụ ahụ nke ga-eso ya ga-adị oke ukwuu.
32Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya.