33“Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile.
34Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt.
35Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche.
36A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”
37Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.