36A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.”
37Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.
38Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?”
39Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.
40Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”