49Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ.
50Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ.
51Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
53Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.