51Josef gụrụ ọkpara ya Manase, nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem. Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
53Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.
54Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.
55Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”