55Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.”
56Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile.
57Mba niile bịara Ijipt ịzụ nri site nʼaka Josef nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼụwa niile.