Jenesis 42

O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.

Genesis 42:17 (UKJV) And he put them all together into ward three days.

15Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.

16Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”

17O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.

18Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.

19Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.