14Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu.
15Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.
16Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.”
17O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ.
18Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke.