1Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya”
2Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.”
3Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka.
4Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.