22Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.”
23Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha.
24O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
25Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,
26ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.