23Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha.
24O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya.
25Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a,
26ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
27Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.