26ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa.
27Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya.
28Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”
29Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
30“Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.