28Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.” Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?”
29Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
30“Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.
31Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.
32Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’