29Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị,
30“Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha.
31Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo.
32Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’
33“Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu.