34Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ”
35Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu.
36Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!”
37Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.”
38Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”