4Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya.
5Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan.
6Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.
7Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.”
8Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.