Jenesis 42

Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.

Genesis 42:8 (UKJV) And Joseph knew his brethren, but they knew not him.

6Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef.

7Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?” Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.”

8Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ.

9Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.”

10Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.