9Aga m eji onwe m gbaa ebe nʼihi ya. I nwere ike itife ya nʼaka m. Ọ bụrụ na m akpọtaghachighị ya, kpọbata ya nʼihu gị, mgbe ahụ, ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị, nʼụbọchị ndụ m niile.
10A sị nnọọ na anyị egbughị oge niile a, anyị gaara aga ma lọtakwarị ugboro abụọ.”
11Mgbe ahụ nna ha Izrel gwara ha sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-adịrịrị otu a, gịnị ọzọ ka anyị ga-eme. Kama mgbe unu na-aga, werenụ nʼakpa unu onyinye ịnata ihuọma nke bụ ihe niile kachasị mma nke si nʼala a welaara nwoke a. Werenụ nwantịntị mmanụ otite, na nwantịntị mmanụ aṅụ, ha na ụda dị iche iche, na eso osisi máá, na akụ, na alụmọnd.
12Werekwanụ ego okpukpu abụọ nʼaka unu. Weghachirinụ ya ego ahụ e tinyere nʼọnụ akpa unu, eleghị anya ọ bụ nʼohihie anya ka ha ji tinye ya.
13Ngwa, kpọrọnụ nwanne unu nwoke bilienụ laghachikwurunụ nwoke ahụ.