Jenesis 43

Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”

Genesis 43:18 (UKJV) And the men were afraid, because they were brought into Joseph's house; and they said, Because of the money that was returned in our sacks at the first time are we brought in; that he may seek occasion against us, and fall upon us, and take us for bondmen, and our asses.

16Mgbe Josef lepụrụ anya hụ Benjamin nʼetiti ha, ọ gwara onye na-elekọta ụlọ ya sị, “Duru ndị ikom ndị a gaa nʼụlọ. Gbuo anụ, kwadoo nri, nʼihi na ndị a ga-eso m rie nri ehihie.”

17Odibo a mere dịka Josef ziri ya. O duuru ndị ikom ndị ahụ gaa nʼụlọ Josef.

18Nʼoge a, mgbe a kpọbatara ha nʼụlọ, ndị ikom ndị ahụ tụrụ ụjọ, nʼihi na a kpọbatara ha nʼime ụlọ Josef. Ha sịrị, “Ọ bụ nʼihi ego ahụ e tighachiri nʼakpa anyị nʼoge mbụ ka e ji kpọbata anyị, ka o nwee ike ịchọta ụzọ ọ ga-esi megide anyị, mesie anyị ike, si otu a were anyị na ịnyịnya ibu anyị dịka ndị ohu ya.”

19Ha bịaruru odibo Josef ahụ nso gwa ya okwu nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

20Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.