Jenesis 43

Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”

Genesis 43:22 (UKJV) And other money have we brought down in our hands to buy food: we cannot tell who put our money in our sacks.

20Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, anyị bịara ebe a nʼoge mbụ ịzụ ihe oriri.

21Ma, mgbe anyị rutere ebe anyị nọrọ ọnọdụ abalị, anyị meghere akpa anyị, chọpụta ego anyị kwụrụ nʼihi nri ahụ anyị zụrụ ka ọ dị nʼọnụ akpa anyị nʼotu na otu. E sepụkwaghị ya ihe ọ bụla. Ya mere, anyị weghachiri ya nʼoge a.

22Anyị jikwa ego ọzọ anyị ga-eji zụọ ihe oriri. Ma anyị amaghị onye tinyere ego ahụ nʼime akpa anyị.”

23Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.

24Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.