Jenesis 43

Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ.

Genesis 43:25 (UKJV) And they made ready the present against Joseph came at noon: for they heard that they should eat bread there.

23Odibo ahụ zara sị ha, “Udo dịrị unu, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu, na Chineke nna unu enyela unu akụ zoro ezo nʼime akpa unu. Ego unu kwụrụ ruru m aka.” Mgbe ahụ, ọ hapụrụ ha gaa kpọpụta Simiọn.

24Nʼoge ahụ, odibo ahụ duuru ndị ikom ndị ahụ bata nʼụlọ Josef, nye ha mmiri ha ji saa ụkwụ ha. O nyekwara ịnyịnya ibu ha nri.

25Mgbe ahụ, ụmụ Jekọb kwadoro onyinye ịnata ihuọma ha ji bịa, nke ha ga-enye Josef ma ọ bata nʼetiti ehihie, nʼihi na ha anụla na ha ga-eri nri nʼebe ahụ.

26Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya.

27Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.