3Juda gwara nna ya bụ Jekọb sị, “Nwoke ahụ dọsiri anyị aka na ntị ike sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanne unu esoghị unu bịa.’
4Ọ bụrụ na ị ga-edunyere anyị nwanne anyị, anyị ga-agbada gaa zụtara gị nri.
5Ma ọ bụrụ na ị gaghị edunyere anyị ya, anyị agaghị agbada, nʼihi na nwoke a sịrị anyị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m ma ọ bụrụ na nwanna unu esoghị unu.’ ”
6Mgbe ahụ Izrel sịrị, “Gịnị mere unu ji wetara m nsogbu dị otu a, site nʼịgwa nwoke ahụ na unu nwere nwanne ọzọ.”
7Ha zara sị, “Nwoke a jụrụ anyị ajụjụ dị iche iche banyere onwe anyị, na ndị ezinaụlọ anyị. Ọ sị, ‘Nna unu, ọ dị ndụ ugbu a? Unu nwere nwanne ọzọ?’ Ya mere, anyị zara ajụjụ niile. O nweghị otu anyị siri mara na ọ ga-asị anyị kpọta nwanne anyị.”