Jenesis 44

Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.

Genesis 44:13 (UKJV) Then they rent their clothes, and laded every man his ass, and returned to the city.

11Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya.

12Odibo ahụ malitere nʼonye ukwu nʼetiti ha chọọ rute nʼonye nta. Ọ bụ nʼakpa Benjamin ka a chọtara iko ahụ.

13Mgbe ahụ, ha dọwara uwe ha nʼihi mwute. Onye ọbụla nʼime ha tighachiri ibu ya nʼelu ịnyịnya ibu ya. Ha niile bidokwara ịlaghachi azụ nʼobodo ha si pụta.

14Mgbe Juda na ụmụnne ya lọghachiri nʼụlọ Josef, ha hụrụ Josef ka ọ nọ nʼebe ahụ. Ha dara nʼala nʼihu ya.

15Ma Josef jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe a unu mere? Ọ bụ na unu amataghị na onye dịka m nwere ike ịmata onye zuru iko m?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.