17Ma Josef sịrị, “Ọ ga-abụrụ m ajọ omume ime ihe dị otu ahụ. Naanị nwoke ahụ a chọpụtara iko ahụ nʼakpa ya bụ onye ga-abụ ohu m. Ma unu onwe unu nwere ike laa nʼudo jekwuru nna unu nʼudo.”
18Juda jekwuuru ya, sị, “Biko, onyenwe m, kwere ka ohu gị gwa gị okwu. Ewesola mụ bụ ohu gị iwe nʼihi na ị nọ ọnọdụ dị ka Fero.
19Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’
20Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’
21“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’