19Onyenwe m, ọ bụ gị jụrụ ndị ohu gị ajụjụ sị, ‘Unu nwere nna maọbụ nwanne?’
20Anyị zara sị, ‘Anyị nwere nna onye bụ agadi, na otu nwa nwoke ọ mụtara nʼagadi ya. Nwanne nwantakịrị nwoke a anwụọla, ya mere naanị otu a fọdụrụ nʼime ụmụ nke nne ha mụtara. Nna ya hụkwara ya nʼanya.’
21“Mgbe ahụ, ị sị ndị ohu gị, ‘Kpọta nwantakịrị a ka m hụ ya anya.’
22Ma anyị gwara onyenwe m sị na ‘Nwata a apụghị ịhapụ nna ya, nʼihi na nna ya ga-anwụ ma ọ bụrụ na ọ hapụ ya.’
23Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’