28Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya.
29Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’
30“Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a,
31mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ.
32Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’