27“Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ.
28Otu nʼime ha funarịrị m, mgbe anụ ọhịa dọkasịrị ya iperipe na iperipe. Ruo ugbu a, ahụbeghị m ya anya.
29Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’
30“Ya mere, ọ bụrụ na m alaghachikwute ohu gị, bụ nna anyị, ma nwantakịrị a esoghị anyị, ebe ọ bụ na e kekọtara ndụ nna anyị na ndụ nwantakịrị a,
31mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ.