Jenesis 45

Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.

Genesis 45:10 (UKJV) And you shall dwell in the land of Goshen, and you shall be near unto me, you, and your children, and your children's children, and your flocks, and your herds, and all that you have:

8“Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile.

9Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m.

10Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere.

11Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’

12“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.