22O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise.
23O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya.
24O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.”
25Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha.
26Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu.