26Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu.
27Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri.
28Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”