Jenesis 46

Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.

Genesis 46:19 (UKJV) The sons of Rachel Jacob's wife; Joseph, and Benjamin.

17Ụmụ ndị ikom Asha bụ, Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera. Ụmụ Beriya bụ, Heba na Malkiel.

18Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ.

19Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.

20Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.

21Ụmụ ndị ikom Benjamin bụ, Bela, Beka, Ashbel, Gera, Neeman, Ehi, Rosh, Mupim, Hupim na Aad.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.