16Ụmụ ndị ikom Gad bụ, Zefọn, na Hagi, na Shuni, na Ezbon, na Eri, na Arodi na Areli.
17Ụmụ ndị ikom Asha bụ, Imna, Ishva, Ishvi na Beriya. Nwanne ha nwanyị bụ Sera. Ụmụ Beriya bụ, Heba na Malkiel.
18Ndị a bụ ụmụ a mụụrụ Jekọb site na Zilpa, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere Lịa nwa ya nwanyị. Ha dị iri na isii nʼọnụọgụgụ.
19Ụmụ ndị ikom Jekọb site na Rechel nwunye ya bụ, Josef na Benjamin.
20Nʼala Ijipt, a mụụrụ Josef Manase na Ifrem, site na nwunye ya Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On.