22Ndị a bụ ndị ikom nke Rechel mụụrụ Jekọb. Ha dị iri na anọ.
23Nwa nwoke nke Dan mụrụ bụ, Hushim.
24Ụmụ ndị ikom Naftalị bụ, Jaziil, na Guni, na Jeza, na Shilem.
25Ndị a bụ ụmụ ndị ikom a mụụrụ Jekọb site na Bilha, odibo nwanyị ahụ Leban kpọnyere nwa ya nwanyị Rechel. Ha niile dị asaa.
26Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii.