Jenesis 46

Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.

Genesis 46:3 (UKJV) And he said, I am God, the God of your father: fear not to go down into Egypt; for I will there make of you a great nation:

1Izrel biliri ije, ya na ihe niile o nwere rute Bịasheba. Ebe a, ọ chụrụ aja nye Chineke nke nna ya Aịzik.

2Chineke gwara Izrel okwu nʼọhụ nke abalị. Ọ sịrị, “Jekọb! Jekọb!” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”

3Chineke gwara ya sị, “Abụ m Chineke, Chineke nke nna gị. Atụla egwu ịgbada Ijipt nʼihi na aga m eme gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu nʼebe ahụ.

4Mụ onwe m ga-eso gị agbada nʼala Ijipt. Mụ onwe m ga-akpọlatakwa gị ọzọ. Josef nʼonwe ya ga-eji aka ya ekpuchikwa gị anya.”

5Jekọb mechara si na Bịasheba pụta. Ụmụ Izrel kuuru Jekọb nna ha, na ụmụaka ha na ndị nwunye ha, kubanye nʼụgbọala ahụ Fero zitere ka ha ji bute ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.