Jenesis 46

Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”

Genesis 46:30 (UKJV) And Israel said unto Joseph, Now let me die, since I have seen your face, because you are yet alive.

28Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,

29Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge.

30Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”

31Mgbe ahụ, Josef gwara ụmụnne ya na ndị ezinaụlọ nna ya niile sị, “Ka m gaa kọọrọ Fero. Ka m gaa sị ya, ‘Ụmụnne m na ezinaụlọ nna m, ndị bi nʼala Kenan abịakwutela m.

32Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.