Jenesis 46

Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,

Genesis 46:28 (UKJV) And he sent Judah before him unto Joseph, to direct his face unto Goshen; and they came into the land of Goshen.

26Ya mere, ndị niile so Jekọb gaa Ijipt, ndị bụ ụmụ ụmụ ya, na-agụghị ndị nwunye ụmụ Jekọb niile, dị iri mmadụ isii na isii.

27Tinyere ụmụ ndị ikom abụọ amụtara nye Josef nʼIjipt, ndị si nʼezinaụlọ Jekọb gara Ijipt dị iri asaa.

28Jekọb zipụrụ Juda ka jekwuru Josef ịjụta ya ụzọ Goshen. Mgbe ha rutere nʼala Goshen,

29Josef kwadoro ịnyịnya ụgbọ ya gawa Goshen izute nna ya Izrel. Mgbe Josef bịara nʼihu nna ya, ọ makụrụ ya, bee akwa ogologo oge.

30Izrel gwara Josef sị, “Ugbu a ejikerela m ịnwụ, ebe m hụrụ ihu gị anya ọzọ, mata na ị ka dị ndụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.