32Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ndị na-elekọta anụ ụlọ. Ha chị igwe ewu na atụrụ ha, na igwe ehi ha, na ihe niile ha ji biri.’
33Ya mere, ọ bụrụ na Fero akpọ unu jụọ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ ọrụ aka unu?’
34Unu ga-asị ya, ‘Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ anụ ụlọ site na mgbe anyị bụ ụmụnta, dịka nna nna anyị ha bụ.’ Mgbe ahụ, ọ ga-ekwe ka unu biri nʼala Goshen. Nʼihi na ndị niile na-azụ ewu na atụrụ bụ ndị akpọrọ asị nʼala Ijipt.”