1Josef gara gwa Fero sị, “Nna m na ụmụnne m ejirila igwe ewu na atụrụ ha, igwe ehi ha na ihe niile ha nwere site nʼala Kenan bịa nʼebe a. Ha nọ nʼala Goshen.”
2Mgbe ọ gara ịgwa Fero okwu, o duuru mmadụ ise nʼetiti ụmụnne ya ndị ikom gosi ha Fero.
3Fero jụrụ ụmụnne ya ajụjụ sị ha, “Gịnị bụ ọrụ aka unu?” Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị bụ ndị ọzụzụ atụrụ dịka nna nna anyị ha.”