Jenesis 46

Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb

Genesis 46:8 (UKJV) And these are the names of the children of Israel, which came into Egypt, Jacob and his sons: Reuben, Jacob's firstborn.

6Ha buuru anụ ụlọ ha niile, na ihe onwunwe ha niile, nke ha kpatara nʼala Kenan, gaa Ijipt. Jekọb na agbụrụ ya niile so.

7Ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị ikom niile, na ụmụ ya ndị inyom niile, na ụmụ ụmụ ya ndị inyom niile, na ndị niile bụ mkpụrụ afọ ya, ka ọ kpọrọ gaa Ijipt.

8Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel, ya bụ Jekọb na ụmụ ụmụ ya, ndị sooro ya gaa Ijipt. Ruben, ọkpara Jekọb

9Ụmụ ndị ikom Ruben bụ, Hanok, na Palu, na Hezrọn na Kami.

10Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ, Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul. Nne Shaul bụ nwanyị Kenan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.