Jenesis 47

Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

Genesis 47:10 (UKJV) And Jacob blessed Pharaoh, and went out from before Pharaoh.

8Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”

9Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.”

10Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

11Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.

12Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.