Jenesis 47

Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.

Genesis 47:12 (UKJV) And Joseph nourished his father, and his brethren, and all his father's household, with bread, according to their families.

10Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

11Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.

12Josef nyere nna ya na ụmụnne ya na ezinaụlọ nna ya nri dịka ọnụọgụgụ nke ụmụ ha si dị.

13Ma nri adịghị nʼala ahụ niile nʼihi na ụnwụ ahụ dị nnọọ njọ. Ihe siri ike nʼala Ijipt ma nʼala Kenan nʼihi ụnwụ a.

14Josef chịkọtara ego niile dị nʼala Ijipt, na nʼala Kenan, nke ndị mmadụ ji kwụọ ụgwọ nri ha zụrụ webata ha nʼụlọeze Fero.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.