Jenesis 47

Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile.

Genesis 47:17 (UKJV) And they brought their cattle unto Joseph: and Joseph gave them bread in exchange for horses, and for the flocks, and for the cattle of the herds, and for the asses: and he fed them with bread for all their cattle for that year.

15Mgbe ego niile dị ndị mmadụ nʼaka gwụchara nʼala Ijipt ma nʼala Kenan, ndị Ijipt niile bịakwutere Josef sị ya, “Nye anyị nri, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ nʼihu gị? Ego anyị agwụla.”

16Mgbe ahụ Josef zara sị ha: “Jirinụ anụ ụlọ unu kwụọ ụgwọ nri m ga-enye unu, ebe ọ bụ na ego unu agwụla.”

17Ya mere, ha kpụtaara Josef anụ ụlọ ha. Josef nyere ha nri nʼọnọdụ ịnyịnya ha, na atụrụ ha, na ewu ha, na ehi, na ịnyịnya ibu ha. O were nri zụọ ha nʼafọ ahụ nʼọnọdụ anụ ụlọ ha niile.

18Mgbe afọ ahụ gafesịrị, ha bịakwutekwara ya nʼafọ nke ọzọ sị ya, “Anyị agaghị ezoro onyenwe anyị na ego anyị agwụla, na igwe anụ ụlọ anyị bụkwa nke gị. O nweghị ihe ọzọ fọdụrụ anyị karịa ahụ anyị na ala anyị.

19Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.